Jeremaya 49

Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.

Jeremiah 49:34 (UKJV) The word of the LORD that came to Jeremiah the prophet against Elam in the beginning of the reign of Zedekiah king of Judah, saying,

32Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha, ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha. Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha. Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

33“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”

34Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.

35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m agbaji ụta nke Elam, bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.

36Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ, nke ga-abịa megide Elam. Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a, ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche, ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.