34Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.
35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m agbaji ụta nke Elam, bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.
36Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ, nke ga-abịa megide Elam. Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a, ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche, ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.
37Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha, e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike. Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha, meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.
38Aga m edo ocheeze m nʼElam, bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.