Jeremaya 49

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m agbaji ụta nke Elam, bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.

Jeremiah 49:35 (UKJV) Thus says the LORD of hosts; Behold, I will break the bow of Elam, the chief of their might.

33“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”

34Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.

35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m agbaji ụta nke Elam, bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.

36Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ, nke ga-abịa megide Elam. Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a, ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche, ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.

37Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha, e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike. Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha, meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.