Jeremaya 50

Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn.

Jeremiah 50:1 (UKJV) The word that the LORD spoke against Babylon and against the land of the Chaldeans by Jeremiah the prophet.

1Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn.

2“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya; bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya. Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị, ‘A ga-adọta Babilọn nʼagha. Ihere ga-emesịa mee Bel; otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi. A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ; oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’

3Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha, mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya, nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.