10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya.
12Ihere ga-eme nne unu, e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu. Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile, bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu.
13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ, nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam. Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya. Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ.
14“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn, unu ndị niile na-agba ụta. Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị.