38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha.
39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.