3Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha, mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya, nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga.
4“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu. Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha.
5Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn. Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ. Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee nʼaka Onyenwe anyị, nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi, nke a na-agaghị echefu echefu.
6“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu. Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha, mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile. Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta. Ha echefuokwala ebe izuike nke ha.
7Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’