28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha, kwadoonụ ndị eze Midia, na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị, na mba niile nke ha na-achị.
29Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.
30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
31Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya, otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ; ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya na a dọtala obodo ya nʼagha,
32na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi, na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ, na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”