30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
31Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya, otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ; ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya na a dọtala obodo ya nʼagha,
32na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi, na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ, na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”
33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka, nʼoge a na-azọcha ya. Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.”
34“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.