26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ. Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile. Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya; kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya: Ararat, na Mini, na Ashkenaz. Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya; ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.
28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha, kwadoonụ ndị eze Midia, na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị, na mba niile nke ha na-achị.
29Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.
30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.