Jeremaya 9

Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn ‘Lee ka anyị si laa nʼiyi! Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu! Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị, nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ”

Jeremiah 9:19 (UKJV) For a voice of wailing is heard out of Zion, How are we spoiled! we are greatly confounded, because we have forsaken the land, because our dwellings have cast us out.

17Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa. E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa.

18Ha bịa ngwangwa kwaa akwa nʼihi anyị, tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya, tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị.

19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn ‘Lee ka anyị si laa nʼiyi! Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu! Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị, nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ”

20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.

21Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.