Jeremaya 9

Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.

Jeremiah 9:21 (UKJV) For death has come up into our windows, and is entered into our palaces, to cut off the children from without, and the young men from the streets.

19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn ‘Lee ka anyị si laa nʼiyi! Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu! Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị, nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ”

20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.

21Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.

22Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ dịka unyi e kpofuru nʼọhịa, dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi, nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ”

23Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya, ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya, ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.