5Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie.
6I bi nʼetiti aghụghọ. Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
7Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m?
8Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”
9Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”