Jeremaya 9

Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”

Jeremiah 9:8 (UKJV) Their tongue is as an arrow shot out; it speaks deceit: one speaks peaceably to his neighbour with his mouth, but in heart he lays his wait.

6I bi nʼetiti aghụghọ. Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

7Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m?

8Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”

9Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”

10Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.