12Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ; okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.
13“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu; ihe ọ pụtara ya pụta.
14Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu, werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?
15A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m. Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.
16Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.