1“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile, ntị m anụla ma ghọtakwa ha.
2Mụ onwe m makwa ihe unu maara; abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.
3Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu, ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.
4Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.
5Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.