8Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
9Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha, Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.
10Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
11Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ, meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.
12“Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.