6Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.
7I nyeghị ndị ike gwuru mmiri, i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.
8Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
9Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha, Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.
10Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.