17Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’
18Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
19Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:
20‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
21“Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.