5Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.
6Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.
7“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.
8Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?