1Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị; ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.
2E si nʼime ala ewepụta igwe, ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.
3Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
4Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.