12Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka, napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.
13Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m; emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.
14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.
15Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.