14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.
15Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.
17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume, si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.
18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.