4Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma, mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,
5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
6mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.
7“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo were ọnọdụ m nʼama.
8Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha, ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;