2“Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga, dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,
3mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.
4Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma, mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,
5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
6mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.