23Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
24Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha.
25Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
26Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,
27nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.