Job 34

Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’

Job 34:9 (UKJV) For he has said, It profits a man nothing that he should delight himself with God.

7Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?

8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.

9Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’

10“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.

11Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.