Job 36

Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.

Job 36:14 (UKJV) They die in youth, and their life is among the unclean.

12Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị, ha ga-ala nʼiyi site na mma agha, ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.

13“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.

14Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.

15Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha; na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.

16“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu, baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị, baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.