10Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka, na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.
11Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi, ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba, biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.
12Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị, ha ga-ala nʼiyi site na mma agha, ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.
13“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha. Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.
14Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha, nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.