29Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?
30Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
31Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.
32O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya, ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.
33Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri; ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.