27“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha, nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.
28Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.
29Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii, ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?
30Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
31Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile na-enyejukwa ha nri afọ.