8Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe; ha na-anọgide nʼebe obibi ha.
9Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
10Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri, ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.
11Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri; na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.
12Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee nʼelu ụwa niile.