6Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’ na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’
7Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya; ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.
8Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe; ha na-anọgide nʼebe obibi ha.
9Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
10Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri, ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.