5Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe; ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.
6Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’ na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’
7Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya; ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.
8Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe; ha na-anọgide nʼebe obibi ha.
9Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.