11Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri; na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.
12Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee nʼelu ụwa niile.
13Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ, na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.
14“Job, gee ntị. Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
15Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii na-eme ka amụma gbuo?