14“Job, gee ntị. Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
15Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii na-eme ka amụma gbuo?
16Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe, nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,
18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?