16Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe, nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,
18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?
19“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya; ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.
20A ga-agwa ya na m nwere okwu? Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?