18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?
19“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya; ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.
20A ga-agwa ya na m nwere okwu? Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?
21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.
22Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.