Job 37

Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.

Job 37:22 (UKJV) Fair weather comes out of the north: with God is terrible majesty.

20A ga-agwa ya na m nwere okwu? Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?

21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.

22Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.

23Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu, nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.

24Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya, ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.