17O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
18Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.
19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi?
20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?
21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.