15A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri.
16“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?
17O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
18Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.
19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi?