20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?
21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.
22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
23nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
24Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe, ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?