22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
23nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
24Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe, ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?
25Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo, onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ?
26Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị, ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya,