27Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
28Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.
29Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
30Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
31Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.