29Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
30Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
31Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.
32Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga; mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.
33O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya, o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.