10Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.
11“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?
12Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?
13Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?
14“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.