14“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.
15Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
16nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
17Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
18Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.