15Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
16nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
17Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
18Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.
19Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri, otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.