17Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
18Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.
19Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri, otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.
20Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi, ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.
21Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru, unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.