25Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
26Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m? Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?
27Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna, ma refukwaa enyi unu.
28“Lezie m anya nke ọma, ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?
29Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi, tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.